Igbo Language Scheme of Work and Lesson Notes – Complete JSS Curriculum Guide
Igbo Language Scheme of Work and Lesson Notes – Complete JSS Curriculum guide. Includes weekly topics on omenala Igbo, ogugu na aghotaazaa, agumagu odinala, and ahuike ndi ntorobia.
Igbo Language Scheme of Work and Lesson Notes – Complete JSS Curriculum Guide
IGBO LANGUAGE SCHEME OF WORK – JUNIOR SECONDARY SCHOOL
| WEEK | TOPIC |
|---|---|
| 1 | Mmeghari ihe ndi e lere n’ule na taam gara aga |
| 2 | Ikowa ufodu omenala Igbo: ufodu omenala gbasara umuakwukwo di ka (i) ikele ekele (ii) iga ozi (iii) irube isi dgz |
| 3 | Ogugu na Aghotaazaa: Ihe ogugu si n’akwukwo |
| 4-5 | Agumagu Odinala (i) ufodu akuko ifo (ii) Abu so ha na egwu ndi ozo (iii) Ejije |
| 6-7 | Udi oru nwoke na nwanyi na-aru ugbua (i) ufodu oru di iche iche (ii) oru naani nwoke na-aru (iii) oru naani nwanyi na-aru (iv) oru nwoke na nwanyi na-aru |
| 8 | Ahuike ndi ntorobia (i) nkowa ndi ntorobia (ii) mgbanwe n’ahu ndi ntorobia (iii) oria ufodu na-emetuta ndi ntorobia (iv) uzo mgbochi oria ndia |
| 9 | Njirimara na nkenudi Agumagu ugbua (1) nkenudi agumagu ugbua i. iduazi ii. ejije iii. abu |
| 10 | Nkenuudi agumagu ugbu a gaa n’ihu: Abu, na njirimara agumagu ugbu a |
| 11 | Mmeghari |
| 12 | Ule |
| 13 | Mmechi |

IZUUKA NKE MBU
Topic: Mmeghari ihe ndi e lere n’ule na taam gara aga
Revision of previous term’s examination topics and assessment.
Read Also:UNIUYO GST 200 Level Philosophy Past Questions & Answers – First Semester Exams (Updated 2025)
IZUUKA NKE ABUO
ISIOKWU: Ikowa Ufodu Omenaala Igbo
Ndinisiokwu:
- Ufodu omenala gbasara umuakwukwo di ka:
- (i) ikele ekele
- (ii) iga ozi
- (iii) irube isi dgz
Nkowa Omenala (Understanding Culture)
Omenala bu uzo ndi obodo o bula di iche iche si ebi ndu ha ka e ji mara ha. Di ka udi uwe ha na-eyi, udi nri ha na-eri, ma obu nkwenye di iche iche ha kwenyere.
Omutụ Atụ:
- Ndi Hausa na-eyi agbada oge niile, nri ha bu tuwo
- Ndi Igbo na-eyi abada. Nri ha bu ji na akpu
Nke a bu omenala ha. Nihi ya omenala igbo bu uzo ndi igbo si ebi ndu ha di iche iche. Anyi maara na ndi igbo bu ndi na-eri nri akpu na ji. Ha na-eme kwa emume di iche iche di ka ilu nwanyi, iwa oji ohuu, ikuputa nwa, iti mmonwu wdg.
NWALE (Assessment Questions):
- Gini bu omenala?
- Kpoputa omenala ndi igbo ato i maara
NDINISIOKWU: UFODU OMENAALA GBASARA UMUAKWUKWO
NDINAYA:
- i. ikele ekele
- ii. iga ozi
- iii. irube isi
(i) Ikele Ekele (Greeting)
Ekele bu uzo esi enye nsopuru. O bu uzo di iche iche mmadu na ibe ya si enwe mmeko. Ekele so n’ihe ndi e ji mara ndi Igbo. Onweghi onye a naghi acho ekele. Ma o bughi gi ka a na-ekele, o buru gi na-ekele mmadu.
A na-ebido n’oge kuziwere nwata etu esi ekele ekele. Ndi Igbo nwere uzo di iche iche ha si ekele mmadu.
Learn more about Igbo language and culture
Ekele ndi igbo e nwere bu:
- Iboola chi – Good morning
- Ndeewo – Welcome
- Jisieike – Well done
- Ka chifo – Good night
- Kaemesia – Goodbye
- Daalu/Imeela – Thank you
- Ije oma – Safe journey, dgz
(ii) Iga Ozi
Iga ozi bu oru nwata ketara n’ezinaulo. O bu ozi ka e ji azulite nwata. O nwere ike buru igara mmadu ibe gi ozi n’udi di iche iche.
Ozi diiiri nwata n’ezinaulo gunyere ndi a:
- Iza ulo na ezi
- Ichu mmiri
- Ikpata nku
- Isachasi efere
- Isu akwa
- Iga gbute nri ewu, dgz
(iii) Irube Isi
Irube isi bu njirimara nwata a zuru azu. Anyi elebala anya n’ikele ekele na iga ozi. Ihe ndi a bu onye na-erube isi nwere ike ime ha. Nwata anaghi erubere nne na nna ya, na ndi toro ya isi, o naghi erubere ndi nkuzi ya isi.
NWALE:
- Gini bu ekele ndi igbo?
- Deputa ekele di iche iche ndi igbo na-ekele
- Kpoputa udi ozi ato i nwere ike i ga n’ezinaulo
- Kedu njirimara nwata a zuru azu?
ORU ULO (Homework)
Deputa ihe ndi a na-ekele ebe ndi a:
- i. Onye na-aru oru
- ii. Onye na-eri nri……
- iii. Onye na alakpu ura…..
- iv. Onye na-aga nje m……
- v. Onye obia………………
Ihe ogugu: Akwukwo maka junio sekondiri nta
IZUUKA NKE ATO (WEEK 3)
ISIOKWU: OGUGU NA AGHOTAAZAA
NDINISIOKWU: IHE OGUGU SI N’AKWUKWO
Nkowa Aghotaazaa
Aghotaazaa bu ajuju na aziza na-eso akuko o bula. Oge onye nkuzi na-akuzi ihe, o bu aghotaazaa ka a na-eme. Oge mmadu abuo na-akparita uka, o bu aghotaazaa ka ha na-eme dgz.
Na aka nke ozo, aghotaazaa bu ederede ahaziri nke oma dee ka aguo, ma zaa ajuju na-esote ya. Aghotaazaa abughi so naani ederede, nke e kwuru n’onu ma zaa ajuju na-esote ya bukwa aghotaazaa.
OGUGU NA AGHOTAAZA – Omutụ Atụ 1
Ederede:
Obi bu dinta, aha obodo ya bu Ihuoma. Aha nkita ya bu Bingo. Obi nwere egbe nma na ube. Ihe ndia na-enyere ya aka na-ichu nta. Obi huru nchi abua Bingo were malite chuwa ha. Otagburu otu mgbe o nwudere ya.
Zaa ajuju ndi a:
- Kedu aha nwoke ahu (a) dinta (b) obi (c) nkita (d) bingo
- Aha nkita ya bu ——- (a) obi (b) dinta (c) nkita (d) bingo
- ——— na ——- na-enyere ya aka ichu nta (a) egbe, mma na ube (b) efere, ngaji na aziza (c) oche, ulo na eku (d) aguba, mkpisi na eku
- ——— Bu aha obodo ya (a) onicha (b) enugwu (c) ihuoma (d) obi
- ——- nwudere nchi? (a) obi (b) nchi (c) bingo (d) nkita
OGUGU NA AGHOTAAZAA – Omutụ Atụ 2
Ederede:
N’ezinaulo Udeozo, o nweghi onye na-ekwutekwa maka Afandu. O buladi nne ya na-abu oge o bula oto n’ariri, obi ya buzi okwute ugbu a. Udeozo n’onwe ya ekpebiela si: Afandu mara ebe o siri bia, ya laghachi, na ohi a dighi n’agburu ha, ka o na-adi be ndi ogo ya.
O gbajiri doro n’ogige ndi uwe ojii n’ogba ubochi Afo. Ndi jere afo ogba lotara na-ako na o nwere ndi ohi ano agbagburu dosa ha na nke ndi uwe ojii. A na-atamu si na ndi Obinagu so n’ime ha. Otutu mmadu wee gawa Ogba ka ha were anya ha hu. Tupu ha aloghachi, o bughizi ihe a na-ezo ezo na Afandu so na mmadu ano ahu. Udeozo, na nwunye ya, Erimma, anukwuola ya. Di ka ndi gara hu n’anya siri koo, naani Afandu bu onye Obinagu di ya. A maghi obodo ndi ozo si.
Zaa ajuju ndi a:
- Afandu bu: (a) onye uwe ojii (b) onye ohi (ch) onye oruugbo (d) onye ahia
- Ndi Obinagu a gbagburu di ole? (a) otu (b) abuo (ch) ato (d) ano
- Ebee ka ogige ndi uwe ojii di? (a) Obinagu (b) Afo Ogba (ch) Afo Obinagu (d) Ogba
- Erimma bu (a) Nwanne Afandu (b) Nne Afandu (ch) Enyi Afandu (d) Nwanne Udeozo
- Gini bu isiokwu akuko a? (a) ihe mere ubochi afo (b) Udeozo na n’ezinaulo ya (ch) ndi ohi e gburu n’Ogba (d) Etu Afandu si laa mmuo
ORU ULO (Homework)
Guo ederede ozo ma zaa ajuju na-esote ya.




One Comment